Ndị Ikpe 1

E nyekwara Kaleb obodo Hebrọn, dịka Mosis kwere ya na nkwa. Kaleb chụpụrụ ụmụ Anak atọ site nʼala ahụ.

Judges 1:20 (UKJV) And they gave Hebron unto Caleb, as Moses said: and he expelled thence the three sons of Anak.

18Ndị agha Juda lụgbukwara obodo Gaza, na Ashkelọn, na Ekrọn, tinyere ala niile gbara ha gburugburu.

19Onyenwe anyị nọnyeekwara ndị Juda mee ka ha kpochapụ ndị niile bi nʼobodo niile dị nʼala ugwu ugwu ahụ. Ma ha enweghị ike ịchụpụ ndị bi nʼala ndagwurugwu ahụ, nʼihi na ndị ahụ nwere ụgbọ agha igwe dị iche iche.

20E nyekwara Kaleb obodo Hebrọn, dịka Mosis kwere ya na nkwa. Kaleb chụpụrụ ụmụ Anak atọ site nʼala ahụ.

21Ndị ebo Benjamin enweghị ike chụpụ ndị Jebus bi na Jerusalem. Nʼihi nke a, ha soro ụmụ Benjamin biri ruo taa.

22Ma ndị sitere nʼebo Josef busoro obodo Betel agha. Onyenwe anyị nọnyeere ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.