Ndị Ikpe 1

Ma ndị sitere nʼebo Josef busoro obodo Betel agha. Onyenwe anyị nọnyeere ha.

Judges 1:22 (UKJV) And the house of Joseph, they also went up against Bethel: and the LORD was with them.

20E nyekwara Kaleb obodo Hebrọn, dịka Mosis kwere ya na nkwa. Kaleb chụpụrụ ụmụ Anak atọ site nʼala ahụ.

21Ndị ebo Benjamin enweghị ike chụpụ ndị Jebus bi na Jerusalem. Nʼihi nke a, ha soro ụmụ Benjamin biri ruo taa.

22Ma ndị sitere nʼebo Josef busoro obodo Betel agha. Onyenwe anyị nọnyeere ha.

23Mgbe ha zipuru ndị ikom ịga nyochapụta obodo Betel, nke a na-akpọ Luz,

24ndị nnyopụta ahụ hụrụ otu nwoke sị nʼobodo ahụ na-apụta. Ha gwara ya okwu sị ya, “Zi anyị ụzọ anyị ga-esi banye nʼime obodo a, anyị ga-ahụ na e mesoro gị mmeso dị mma.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.