Ndị Ikpe 1

ndị nnyopụta ahụ hụrụ otu nwoke sị nʼobodo ahụ na-apụta. Ha gwara ya okwu sị ya, “Zi anyị ụzọ anyị ga-esi banye nʼime obodo a, anyị ga-ahụ na e mesoro gị mmeso dị mma.”

Judges 1:24 (UKJV) And the spies saw a man come forth out of the city, and they said unto him, Show us, we pray you, the entrance into the city, and we will show you mercy.

22Ma ndị sitere nʼebo Josef busoro obodo Betel agha. Onyenwe anyị nọnyeere ha.

23Mgbe ha zipuru ndị ikom ịga nyochapụta obodo Betel, nke a na-akpọ Luz,

24ndị nnyopụta ahụ hụrụ otu nwoke sị nʼobodo ahụ na-apụta. Ha gwara ya okwu sị ya, “Zi anyị ụzọ anyị ga-esi banye nʼime obodo a, anyị ga-ahụ na e mesoro gị mmeso dị mma.”

25Ya mere, nwoke ahụ gosiri ha ụzọ, ha ji mma agha gbuo mmadụ niile bi nʼime obodo ahụ, ma ha hapụrụ nwoke ahụ na ezinaụlọ ya ndụ.

26Emesịa, nwoke ahụ kpọọrọ ezinaụlọ ya gaa biri nʼala ndị Het wuoro onwe ya otu obodo nʼebe ahụ. Ọ kpọrọ aha obodo ahụ Luz, nke bụkwa aha obodo ahụ ruo taa.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.