5Nʼebe ahụ ka ha zutere Adoni-Bezek, buso ya agha, tigbukwaa ndị Kenan na ndị Periz.
6Ma Adoni-Bezek gbapụrụ ọsọ zoo onwe ya, ma ha chụgidere ya, jide ya, gbupụ ya isi mkpụrụ aka ya abụọ na isi mkpụrụ ụkwụ ya abụọ.
7Mgbe ahụ, Adoni-Bezek sịrị, “Iri ndị eze asaa ka m mesoro ụdị mmeso a unu mesoro m, ọ bụkwa nri si na tebul m dapụ ka ha riri. Ugbu a Chineke akwụghachila m ụgwọ ọrụ ọjọọ m.” Ha kpụụrụ ya gaa Jerusalem, ebe ọ nọ nwụọ.
8Ndị Juda busoro obodo Jerusalem agha, were mma agha gbuchapụ mmadụ niile bi nʼime ya, ma gbaakwa obodo ahụ niile ọkụ.
9Mgbe nke a gasịrị, ndị agha Juda busoro ndị Kenan bi na ndịda ala ugwu ugwu ahụ, bụ Negev, ya na akụkụ ọdịda anyanwụ nʼebe dị ala ala.