1Mgbe Abimelek nwụsịrị, Tola nwa Pua, nwa nwa Dodo, biliri ịzọpụta Izrel. O si nʼebo Isaka pụta. Ọ bụkwa nʼobodo Shamia ka o bi, nʼime obodo e wukwasịrị nʼelu ugwu Ifrem.
2O kpere Izrel ikpe iri afọ abụọ na atọ. Mgbe ọ nwụrụ, e liri ya na Shamia.
3Onye ikpe ọzọ nọchiri ya bụ Jaịa, onye si Gilead pụta. O kpere Izrel ikpe iri afọ abụọ na abụọ.