10Nʼikpeazụ, ụmụ Izrel tikuru Onyenwe anyị mkpu akwa, rịọọ ya ka ọ gbapụta ha. Ha kwupụtara sị, “Anyị emehiela megide gị, anyị ahapụla gị Chineke anyị, fee arụsị Baal ofufe.”
11Ma Onyenwe anyị sịrị ndị Izrel, “Mgbe ndị Ijipt, ndị Amọrait, ndị Amọn, ndị Filistia,
12ndị Saịdọn, ndị Amalek na ndị Maon kpagburu unu; unu tikuru m mkpu akwa inyere unu aka, ọ bụ na m anapụtaghị unu site nʼaka ha?
13Ma unu nọgidere na-agbakụta m azụ oge niile, na-efe chi ndị ọzọ ofufe. Ya mere, gawaranụ onwe unu, agaghị m anapụtakwa unu ọzọ.
14Kpọkuonụ chi ndị ahụ bụ ndị unu họpụtaara onwe unu, ka ha zọpụta unu mgbe ọbụla nsogbu dakwasịrị unu!”