12ndị Saịdọn, ndị Amalek na ndị Maon kpagburu unu; unu tikuru m mkpu akwa inyere unu aka, ọ bụ na m anapụtaghị unu site nʼaka ha?
13Ma unu nọgidere na-agbakụta m azụ oge niile, na-efe chi ndị ọzọ ofufe. Ya mere, gawaranụ onwe unu, agaghị m anapụtakwa unu ọzọ.
14Kpọkuonụ chi ndị ahụ bụ ndị unu họpụtaara onwe unu, ka ha zọpụta unu mgbe ọbụla nsogbu dakwasịrị unu!”
15Ma ndị Izrel sịrị Onyenwe anyị, “Anyị emehiela. Mee anyị ihe ọbụla i chere dị gị mma, ma biko, zọpụta anyị taa.”
16Ha sitere nʼetiti ha wezuga chi ala ọzọ niile dị iche iche, fee Onyenwe anyị ofufe. O nweghịkwa ike nagide ọnọdụ ọjọọ ndị Izrel gaa nʼihu.