Ndị Ikpe 11

Otu ọ dị, Jefta, onye Gilead, bụ dimkpa nʼagha. Nna ya bụ Gilead; nne ya bụ akwụna.

Judges 11:1 (UKJV) Now Jephthah the Gileadite was a mighty man of valour, and he was the son of an harlot: and Gilead brings forth Jephthah.

1Otu ọ dị, Jefta, onye Gilead, bụ dimkpa nʼagha. Nna ya bụ Gilead; nne ya bụ akwụna.

2Nwunye Gilead mụtaara ya ọtụtụ ụmụ ndị ikom ọzọ. Mgbe ha tolitere, ha chụpụrụ Jefta site nʼobodo ahụ, sị ya, “Ị gaghị eketa ihe ọbụla nʼezi nna anyị, nʼihi na nwa nwanyị ọzọ ka ị bụ.”

3Nʼihi nke a, Jefta gbapụrụ site nʼụlọ nna ya, gaa biri nʼobodo Tob. Mgbe na-adịghị anya, ọtụtụ ndị isi na-anụ ọkụ bịara nọnyere ya ma sorokwa ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.