Ndị Ikpe 11

Nna ya zara sị ya, “E, nwa m, i nwere ike ịga.” Ọ pụrụ gaa, jegharịa, kwaakwa akwa, ya na ụmụ agbọghọ ndị enyi ya, ruo mgbe ọnwa abụọ ahụ zuru.

Judges 11:38 (UKJV) And he said, Go. And he sent her away for two months: and she went with her companions, and bewailed her virginity upon the mountains.

36Ọ zara, “Nna m, lee, ị ghaghị imezu ihe i kwere Onyenwe anyị na nkwa. Jiri m mee ihe i kwere Onyenwe anyị na nkwa, nʼihi na o nyela gị mmeri dị ukwuu nʼebe ndị Amọn, ndị iro gị nọ.

37Ma ọ dị otu ihe m chọrọ ịrịọ gị, biko kwere ka m soro ụmụ agbọghọ ibe m gaa wagharịa nʼugwu ndị a, ka mụ na ha kwaa akwa ọnwa abụọ, nʼihi na agaghị m alụ di.”

38Nna ya zara sị ya, “E, nwa m, i nwere ike ịga.” Ọ pụrụ gaa, jegharịa, kwaakwa akwa, ya na ụmụ agbọghọ ndị enyi ya, ruo mgbe ọnwa abụọ ahụ zuru.

39Mgbe ọnwa abụọ gasịrị, ọ laghachikwutere nna ya, onye ji ya mezuo nkwa ahụ o kwere. Ọ bụ nwaagbọghọ na-amatabeghị nwoke. Malite nʼoge ahụ ka ọ ghọrọ omenaala ndị Izrel,

40na ụmụ agbọghọ na-apụ kwa afọ, gaa, nọọ abalị anọ nʼihi icheta ada Jefta, onye Gilead.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.