34Mgbe Jefta lọghachiri nʼụlọ ya na Mizpa, ma lee ada ya nwanyị onye ji iti egwu na ite egwu pụta izute ya. Ọ bụ naanị ya ka nna ya mụtara. Ewezuga ya, nna ya amụtaghị nwa nwoke maọbụ nwa nwanyị ọzọ.
35Mgbe Jefta hụrụ ya, ọ dọwara uwe ya, tie mkpu sị, “Ewoo, nwa m nwanyị! I wetarala obi m ihe mgbu, nʼihi na ekwela m Onyenwe anyị nkwa, nke m na-aghaghị imezu.”
36Ọ zara, “Nna m, lee, ị ghaghị imezu ihe i kwere Onyenwe anyị na nkwa. Jiri m mee ihe i kwere Onyenwe anyị na nkwa, nʼihi na o nyela gị mmeri dị ukwuu nʼebe ndị Amọn, ndị iro gị nọ.
37Ma ọ dị otu ihe m chọrọ ịrịọ gị, biko kwere ka m soro ụmụ agbọghọ ibe m gaa wagharịa nʼugwu ndị a, ka mụ na ha kwaa akwa ọnwa abụọ, nʼihi na agaghị m alụ di.”
38Nna ya zara sị ya, “E, nwa m, i nwere ike ịga.” Ọ pụrụ gaa, jegharịa, kwaakwa akwa, ya na ụmụ agbọghọ ndị enyi ya, ruo mgbe ọnwa abụọ ahụ zuru.