9Chineke zara ekpere ya. Mmụọ ozi ahụ bịakwutekwara nwunye Manoa mgbe ọ nọ nʼubi; maọbụ naanị ya nọ, di ya anọghị ya.
10Ya mere, nwanyị ahụ gbara ọsọ gaa gwa di ya sị, “Lee, nwoke ahụ bịakwutere m ụbọchị a, abịala ọzọ!”
11Manoa biliri, soro nwunye ya. Mgbe o bịarutere ebe nwoke ahụ nọ, ọ jụrụ ya ajụjụ sị, “Ọ bụ gị bụ nwoke ahụ gwara nwunye m okwu nʼoge gara aga?” Ọ zara sị ya, “E, ọ bụ m.”
12Manoa gwara ya okwu sị, “Mgbe okwu gị mezuru, gịnị bụ iwu banyere ndụ na ọrụ nwa nwoke a?”
13Mmụọ ozi Onyenwe anyị zaghachiri, “Nwunye gị aghaghị imezu ihe niile m nke m gwara ya.