1Ndị Izrel mehiekwara ọzọ nʼihu onyenwe anyị. Nʼihi nke a, Onyenwe anyị kwenyere ka ndị Filistia merie ha. Ndị Izrel nọrọ nʼokpuru ọchịchị ha iri afọ anọ.
2Nʼoge ahụ, o nwere otu nwoke onye Zora aha ya bụ Manoa. Nwoke a si nʼagbụrụ Dan, nwunye ya bụ nwanyị aga nke mere na ọ mụtaghị nwa.
3Otu ụbọchị, mmụọ ozi Onyenwe anyị gosiri nwanyị a onwe ya, gwa ya okwu sị, “Ọ bụ ezie na ị bụ nwanyị aga nke mere na ị mụtaghị nwa ma na mgbe na-adịghị anya, ị ga-atụrụ ime mụta nwa.
4Ma site ugbu a, gaa nʼihu, aṅụkwala ihe ọṅụṅụ ọbụla na-aba nʼanya. Erikwala ihe ọbụla rụrụ arụ.