Ndị Ikpe 13

Otu ụbọchị, mmụọ ozi Onyenwe anyị gosiri nwanyị a onwe ya, gwa ya okwu sị, “Ọ bụ ezie na ị bụ nwanyị aga nke mere na ị mụtaghị nwa ma na mgbe na-adịghị anya, ị ga-atụrụ ime mụta nwa.

Judges 13:3 (UKJV) And the angel of the LORD appeared unto the woman, and said unto her, Behold now, you are barren, and bear not: but you shall conceive, and bear a son.

1Ndị Izrel mehiekwara ọzọ nʼihu onyenwe anyị. Nʼihi nke a, Onyenwe anyị kwenyere ka ndị Filistia merie ha. Ndị Izrel nọrọ nʼokpuru ọchịchị ha iri afọ anọ.

2Nʼoge ahụ, o nwere otu nwoke onye Zora aha ya bụ Manoa. Nwoke a si nʼagbụrụ Dan, nwunye ya bụ nwanyị aga nke mere na ọ mụtaghị nwa.

3Otu ụbọchị, mmụọ ozi Onyenwe anyị gosiri nwanyị a onwe ya, gwa ya okwu sị, “Ọ bụ ezie na ị bụ nwanyị aga nke mere na ị mụtaghị nwa ma na mgbe na-adịghị anya, ị ga-atụrụ ime mụta nwa.

4Ma site ugbu a, gaa nʼihu, aṅụkwala ihe ọṅụṅụ ọbụla na-aba nʼanya. Erikwala ihe ọbụla rụrụ arụ.

5Ị ga-atụrụ ime, mụkwaa nwa nwoke, onye agụba agaghị aba nʼisi ya, nʼihi na ọ ga-abụ onye e kewapụrụ nye Chineke site nʼime akpanwa. Ọ ga-ebute ụzọ nʼịgbapụta Izrel site nʼaka ndị Filistia.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.