23Ma nwunye ya zara sị ya, “Ọ bụrụ na Onyenwe anyị chọrọ igbu anyị, ọ garaghị anara aja nsure ọkụ, na aja mkpụrụ ọka anyị chụrụ nye ya. Ọzọkwa, ọ garaghị egosi anyị ihe ndị a niile maọbụ gwa anyị ihe ndị a.”
24Emesịa, nwanyị ahụ mụrụ nwa nwoke, onye ha gụrụ Samsin. Onyenwe anyị gọzikwara nwantakịrị ahụ mgbe ọ na-etolite.
25Mmụọ Onyenwe anyị bidokwara na-agba ya ume nʼoge niile, mgbe ọ nọ Mahane Dan, nke dị nʼetiti Zora na Eshtaol.