21Mgbe Mmụọ ozi Onyenwe anyị na-egosighị onwe ya ọzọ nye Manoa na nwunye ya, ka Manoa ghọtara na ọ bụ Mmụọ ozi Onyenwe anyị ka ha hụrụ.
22Manoa gwara nwunye ya sị, “Anyị abụrụla ndị nwụrụ anwụ, nʼihi na anyị ahụla Chineke!”
23Ma nwunye ya zara sị ya, “Ọ bụrụ na Onyenwe anyị chọrọ igbu anyị, ọ garaghị anara aja nsure ọkụ, na aja mkpụrụ ọka anyị chụrụ nye ya. Ọzọkwa, ọ garaghị egosi anyị ihe ndị a niile maọbụ gwa anyị ihe ndị a.”
24Emesịa, nwanyị ahụ mụrụ nwa nwoke, onye ha gụrụ Samsin. Onyenwe anyị gọzikwara nwantakịrị ahụ mgbe ọ na-etolite.
25Mmụọ Onyenwe anyị bidokwara na-agba ya ume nʼoge niile, mgbe ọ nọ Mahane Dan, nke dị nʼetiti Zora na Eshtaol.