Ndị Ikpe 14

Mgbe ahụ nwunye Samsin buuru onwe ya tụọ nʼelu ahụ ya, nʼebe akwa, sị, “Ị kpọrọ m asị! Nʼezie, ị hụghị m nʼanya. Ị tụụrụ ndị m ilu, ma ị gwaghị m ọsịsa ya.” Ọ sịrị ya, “Lee, agwaghị m nne na nna m, ọ bụkwa gị ka m ga akọwara ya?”

Judges 14:16 (UKJV) And Samson's wife wept before him, and said, You do but hate me, and love me not: you have put forth a riddle unto the children of my people, and have not told it me. And he said unto her, Behold, I have not told it my father nor my mother, and shall I tell it you?

14Ọ gwara ha sị, “Ihe oriri si nʼime onye na-eri eri na-apụta, ọzọkwa, ihe dị ụtọ si nʼime onye dị ike pụta.” Mgbe ụbọchị atọ gasịrị, ha enwebeghịkwa ike kọwaa ya.

15Ma nʼụbọchị nke anọ, ha jekwuuru nwunye Samsin gwa ya okwu sị, “Chọọ ụzọ rafụta di gị ọnụ, ka ọ gwa gị ihe okwu a pụtara. Ma ọ bụghị ya, anyị ga-akpọ gị na ezinaụlọ nna gị ọkụ. Ọ bụ ịnapụ anyị ihe anyị nwere ka unu ji kpọọ anyị oku bịa nʼebe?”

16Mgbe ahụ nwunye Samsin buuru onwe ya tụọ nʼelu ahụ ya, nʼebe akwa, sị, “Ị kpọrọ m asị! Nʼezie, ị hụghị m nʼanya. Ị tụụrụ ndị m ilu, ma ị gwaghị m ọsịsa ya.” Ọ sịrị ya, “Lee, agwaghị m nne na nna m, ọ bụkwa gị ka m ga akọwara ya?”

17Ma nwanyị ahụ kwagidere akwa abalị asaa ha nọ na mmemme ahụ. Nʼikpeazụ, nʼụbọchị nke asaa, Samsin kọwaara ya okwu ahụ nʼihi na ọ nọgidere na-enye ya nsogbu. Nwanyị ahụ gakwara kọwaara ụmụ okorobịa obodo ihe okwu ahụ pụtara.

18Ma tupu anwụ adaa nʼụbọchị nke asaa ahụ, ndị ikom obodo ahụ sịrị ya, “Olee ihe dị ụtọ karịa mmanụ aṅụ? Gịnị dịkwa ike karịa ọdụm?” Ma Samsin zara sị ha, “A sị na unu enyeghị nwa ehi m nsogbu, unu agaraghị enwe ike kọwaa ya.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.