Ndị Ikpe 14

Ma tupu anwụ adaa nʼụbọchị nke asaa ahụ, ndị ikom obodo ahụ sịrị ya, “Olee ihe dị ụtọ karịa mmanụ aṅụ? Gịnị dịkwa ike karịa ọdụm?” Ma Samsin zara sị ha, “A sị na unu enyeghị nwa ehi m nsogbu, unu agaraghị enwe ike kọwaa ya.”

Judges 14:18 (UKJV) And the men of the city said unto him on the seventh day before the sun went down, What is sweeter than honey? And what is stronger than a lion? and he said unto them, If all of you had not plowed with my heifer, all of you had not found out my riddle.

16Mgbe ahụ nwunye Samsin buuru onwe ya tụọ nʼelu ahụ ya, nʼebe akwa, sị, “Ị kpọrọ m asị! Nʼezie, ị hụghị m nʼanya. Ị tụụrụ ndị m ilu, ma ị gwaghị m ọsịsa ya.” Ọ sịrị ya, “Lee, agwaghị m nne na nna m, ọ bụkwa gị ka m ga akọwara ya?”

17Ma nwanyị ahụ kwagidere akwa abalị asaa ha nọ na mmemme ahụ. Nʼikpeazụ, nʼụbọchị nke asaa, Samsin kọwaara ya okwu ahụ nʼihi na ọ nọgidere na-enye ya nsogbu. Nwanyị ahụ gakwara kọwaara ụmụ okorobịa obodo ihe okwu ahụ pụtara.

18Ma tupu anwụ adaa nʼụbọchị nke asaa ahụ, ndị ikom obodo ahụ sịrị ya, “Olee ihe dị ụtọ karịa mmanụ aṅụ? Gịnị dịkwa ike karịa ọdụm?” Ma Samsin zara sị ha, “A sị na unu enyeghị nwa ehi m nsogbu, unu agaraghị enwe ike kọwaa ya.”

19Otu mgbe ahụ kwa, Mmụọ Onyenwe anyị bịakwasịrị ya. O sitere nʼebe ahụ pụọ, gaa nʼobodo Ashkelọn. Nʼebe ahụ ka ọ nọ tigbuo iri mmadụ atọ, napụ ha uwe ha niile, chịrị ha chịnye ndị ahụ kọwaara ya ilu ahụ. Ma site nʼoke iwe, o laghachiri nʼụlọ nna ya.

20E duuru nwunye Samsin dunye enyi Samsin ka ha abụọ bụrụ di na nwunye.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.