18Ma tupu anwụ adaa nʼụbọchị nke asaa ahụ, ndị ikom obodo ahụ sịrị ya, “Olee ihe dị ụtọ karịa mmanụ aṅụ? Gịnị dịkwa ike karịa ọdụm?” Ma Samsin zara sị ha, “A sị na unu enyeghị nwa ehi m nsogbu, unu agaraghị enwe ike kọwaa ya.”
19Otu mgbe ahụ kwa, Mmụọ Onyenwe anyị bịakwasịrị ya. O sitere nʼebe ahụ pụọ, gaa nʼobodo Ashkelọn. Nʼebe ahụ ka ọ nọ tigbuo iri mmadụ atọ, napụ ha uwe ha niile, chịrị ha chịnye ndị ahụ kọwaara ya ilu ahụ. Ma site nʼoke iwe, o laghachiri nʼụlọ nna ya.
20E duuru nwunye Samsin dunye enyi Samsin ka ha abụọ bụrụ di na nwunye.