Ndị Ikpe 14

Otu mgbe ahụ kwa, Mmụọ Onyenwe anyị bịakwasịrị ya. O sitere nʼebe ahụ pụọ, gaa nʼobodo Ashkelọn. Nʼebe ahụ ka ọ nọ tigbuo iri mmadụ atọ, napụ ha uwe ha niile, chịrị ha chịnye ndị ahụ kọwaara ya ilu ahụ. Ma site nʼoke iwe, o laghachiri nʼụlọ nna ya.

Judges 14:19 (UKJV) And the Spirit of the LORD came upon him, and he went down to Ashkelon, and slew thirty men of them, and took their spoil, and gave change of garments unto them which expounded the riddle. And his anger was kindled, and he went up to his father's house.

17Ma nwanyị ahụ kwagidere akwa abalị asaa ha nọ na mmemme ahụ. Nʼikpeazụ, nʼụbọchị nke asaa, Samsin kọwaara ya okwu ahụ nʼihi na ọ nọgidere na-enye ya nsogbu. Nwanyị ahụ gakwara kọwaara ụmụ okorobịa obodo ihe okwu ahụ pụtara.

18Ma tupu anwụ adaa nʼụbọchị nke asaa ahụ, ndị ikom obodo ahụ sịrị ya, “Olee ihe dị ụtọ karịa mmanụ aṅụ? Gịnị dịkwa ike karịa ọdụm?” Ma Samsin zara sị ha, “A sị na unu enyeghị nwa ehi m nsogbu, unu agaraghị enwe ike kọwaa ya.”

19Otu mgbe ahụ kwa, Mmụọ Onyenwe anyị bịakwasịrị ya. O sitere nʼebe ahụ pụọ, gaa nʼobodo Ashkelọn. Nʼebe ahụ ka ọ nọ tigbuo iri mmadụ atọ, napụ ha uwe ha niile, chịrị ha chịnye ndị ahụ kọwaara ya ilu ahụ. Ma site nʼoke iwe, o laghachiri nʼụlọ nna ya.

20E duuru nwunye Samsin dunye enyi Samsin ka ha abụọ bụrụ di na nwunye.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.