12Ha sịrị ya, “Anyị abịala ka anyị kee gị agbụ, dọkpụrụ gị, nye nʼaka ndị Filistia.” Samsin sịrị ha, “Ṅụọrọnụ m iyi na unu agaghị eji aka unu gbuo m.”
13Ha zara sị ya, “Anyị agaghị egbu gị kama anyị ga-eke gị agbụ.” Ya mere, ha kere ya agbụ, duru ya jekwuru ndị Filistia.
14Mgbe ọ na-abịaru Lehi, ndị Filistia tiiri mkpu, bịa izute ya. Mmụọ Onyenwe anyị bịakwasịrị Samsin nʼebe ọ dị ukwuu. Nke a mere ka eriri ahụ e kere ya nʼaka dịrị ka eriri ogho flakisi erere ọkụ, sitekwa nʼaka ya dapụsịa.
15Mgbe ahụ Samsin lere anya gburugburu, hụ ọkpụkpụ agba ịnyịnya ibu nke tọgbọrọ nʼala nʼebe ahụ. Ọ tụtụlitere ya, were ya tigbuo puku ndị agha Filistia.
16Mgbe ahụ, Samsin kwuru sị, “E ji m agba ịnyịnya ibu mee ka ha dị ka ịnyịnya ibu. E ji m agba ịnyịnya ibu tigbuo puku ndị ikom.”