Ndị Ikpe 15

Mgbe ahụ, Samsin kwuru sị, “E ji m agba ịnyịnya ibu mee ka ha dị ka ịnyịnya ibu. E ji m agba ịnyịnya ibu tigbuo puku ndị ikom.”

Judges 15:16 (UKJV) And Samson said, With the jawbone of an ass, heaps upon heaps, with the jaw of an ass have I slain a thousand men.

14Mgbe ọ na-abịaru Lehi, ndị Filistia tiiri mkpu, bịa izute ya. Mmụọ Onyenwe anyị bịakwasịrị Samsin nʼebe ọ dị ukwuu. Nke a mere ka eriri ahụ e kere ya nʼaka dịrị ka eriri ogho flakisi erere ọkụ, sitekwa nʼaka ya dapụsịa.

15Mgbe ahụ Samsin lere anya gburugburu, hụ ọkpụkpụ agba ịnyịnya ibu nke tọgbọrọ nʼala nʼebe ahụ. Ọ tụtụlitere ya, were ya tigbuo puku ndị agha Filistia.

16Mgbe ahụ, Samsin kwuru sị, “E ji m agba ịnyịnya ibu mee ka ha dị ka ịnyịnya ibu. E ji m agba ịnyịnya ibu tigbuo puku ndị ikom.”

17Mgbe o kwuchara ihe ndị a, o tufuru ọkpụkpụ agba ịnyịnya ibu ahụ; a kpọkwara ebe ahụ Ramat Lehi.

18Nʼoge a, akpịrị kpọrọ Samsin nkụ nke ukwuu, nʼihi ya, ọ kpọkuru Onyenwe anyị nʼekpere sị, “Lee, i nyela ohu gị mmeri a dị ukwuu! Ma ugbu a, ị ga-ekwe ka m nwụọ nʼihi akpịrị ịkpọ nku, si otu a daba nʼaka ndị a na-ebighị ugwu?”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.