Ndị Ikpe 15

Mgbe o kwuchara ihe ndị a, o tufuru ọkpụkpụ agba ịnyịnya ibu ahụ; a kpọkwara ebe ahụ Ramat Lehi.

Judges 15:17 (UKJV) And it came to pass, when he had made an end of speaking, that he cast away the jawbone out of his hand, and called that place Ramathlehi.

15Mgbe ahụ Samsin lere anya gburugburu, hụ ọkpụkpụ agba ịnyịnya ibu nke tọgbọrọ nʼala nʼebe ahụ. Ọ tụtụlitere ya, were ya tigbuo puku ndị agha Filistia.

16Mgbe ahụ, Samsin kwuru sị, “E ji m agba ịnyịnya ibu mee ka ha dị ka ịnyịnya ibu. E ji m agba ịnyịnya ibu tigbuo puku ndị ikom.”

17Mgbe o kwuchara ihe ndị a, o tufuru ọkpụkpụ agba ịnyịnya ibu ahụ; a kpọkwara ebe ahụ Ramat Lehi.

18Nʼoge a, akpịrị kpọrọ Samsin nkụ nke ukwuu, nʼihi ya, ọ kpọkuru Onyenwe anyị nʼekpere sị, “Lee, i nyela ohu gị mmeri a dị ukwuu! Ma ugbu a, ị ga-ekwe ka m nwụọ nʼihi akpịrị ịkpọ nku, si otu a daba nʼaka ndị a na-ebighị ugwu?”

19Chineke gbawara olulu ahụ nke dị nʼime Lehi, mee ka mmiri si na ya nupụta. Mgbe Samsin ṅụrụ mmiri ahụ, ike ya lọghachiri, mmụọ ya bịaghachikwara. Ya mere, a kpọrọ isi iyi ahụ En-Hakkore. Mmiri ala ahụ ka dịkwa na Lehi nʼebe ahụ ruo taa.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.