6Mgbe ndị Filistia chọpụtara ihe mere, ha jụrụ sị, “Onye mere ihe dị otu a?” A gwara ha, “Ọ bụ Samsin ọgọ onye Timna, nʼihi na a kpọnyere enyi ya nwunye ya.” Nʼihi nke a, ndị Filistia niile zukọtara kpọpụta nwaagbọghọ ahụ na nna ya kpọọ ha ọkụ.
7Ma Samsin gwara ha okwu sị, “Ebe ọ bụ na unu mere ihe dị otu a, agaghị akwụsị tutu m bọrọ ọbọ ihe ọjọọ unu mere.”
8Ya mere, ọ pụkwuru ha ọzọ, site nʼoke iwe, gbuo ọtụtụ mmadụ nʼime ha. Mgbe nke a gasịrị, ọ gara biri nʼime otu ọgba nkume nke Etam.
9Ndị Filistia gara maa ụlọ ikwu ha nʼala Juda, gbasaa nʼala ahụ ruo obodo Lehi.
10Ndị Juda jụrụ ajụjụ sị ha; “Ọ bụ gịnị mere unu ji bịa nʼebe a ibuso anyị agha?” Ha zara sị, “Anyị na-achọ ijide Samsin, ka anyị megwara ya ihe ọjọọ o mere anyị.”