Ndị Ikpe 16

Nʼoge a, mmadụ ejupụtala nʼime ụlọ ahụ, nwoke na nwanyị; ndịisi ọchịchị ndị Filistia nọkwa nʼebe ahụ. Ndị ọzọ ọnụọgụgụ ha ruru puku atọ, nwoke na nwanyị, nọ nʼelu ụlọ ahụ na-ele Samsin, ebe ọ na-emere ha ihe ọchị.

Judges 16:27 (UKJV) Now the house was full of men and women; and all the lords of the Philistines were there; and there were upon the roof about three thousand men and women, that beheld while Samson made sport.

25Mgbe ha ka nọ nʼobi ụtọ, ha tiri mkpu sị, “Dupụtara anyị Samsin, ka o kpaa anyị ọchị.” Ya mere, e dupụtara Samsin site nʼụlọ mkpọrọ ka o meere ha ihe egwuregwu. Ha mere ka o guzo nʼetiti ebe ogidi e ji wuo ụlọ ahụ dị.

26Mgbe ahụ, Samsin sịrị onye na-eji ya nʼaka sị, “Debe m nʼebe m ga-emetụ ogidi ndị ụlọ a na-eguzo na ha aka, ka m nwe ike dabere na ha.”

27Nʼoge a, mmadụ ejupụtala nʼime ụlọ ahụ, nwoke na nwanyị; ndịisi ọchịchị ndị Filistia nọkwa nʼebe ahụ. Ndị ọzọ ọnụọgụgụ ha ruru puku atọ, nwoke na nwanyị, nọ nʼelu ụlọ ahụ na-ele Samsin, ebe ọ na-emere ha ihe ọchị.

28Mgbe ahụ, Samsin kpere ekpere rịọọ Onyenwe anyị arịrịọ sị, “O! Onyenwe m Onyenwe anyị, biko cheta m naanị otu ugbu a. Biko, Chineke, nye m ike nʼotu ohere a m nwere, ka m nwee ike ịbọrọ ọbọ nʼahụ ndị Filistia nʼihi, ọ bụladị, mkpụrụ anya m abụọ.”

29Mgbe ahụ, Samsin jidesiri ogidi abụọ dị nʼetiti ụlọ ahụ aka ike, aka nri ya nʼotu, aka ekpe ya na nke ọzọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.