Ndị Ikpe 17

Otu nwokorobịa onye Livayị, sitere nʼobodo Betlehem nke dị na Juda, bụ onye binyere ndị agbụrụ Juda,

Judges 17:7 (UKJV) And there was a young man out of Bethlehemjudah of the family of Judah, who was a Levite, and he sojourned there.

5Nwoke ahụ bụ Maịka nwere ụlọ arụsị, o mere efọọd na arụsị ezinaụlọ dị iche iche, mee otu nʼime ụmụ ya ndị ikom ka ọ bụrụ onye nchụaja ya.

6Nʼụbọchị ndị a, Izrel enweghị eze na-achị ha. Nʼihi nke a, onye ọbụla na-eme ihe ọbụla ọ chọrọ, na ihe ọbụla dị ya mma nʼanya.

7Otu nwokorobịa onye Livayị, sitere nʼobodo Betlehem nke dị na Juda, bụ onye binyere ndị agbụrụ Juda,

8hapụrụ obodo ahụ, bụ Betlehem Juda ịchọ ọnọdụ nʼebe ọzọ. Mgbe ọ na-aga, ọ bịaruru nʼụlọ Maịka nʼala ugwu ugwu Ifrem.

9Maịka jụrụ ya, “Ebee ka i si bịa?” Ọ sịrị “Abụ m onye Livayị si Betlehem dị na Juda. Ana m achọrọ onwe m ebe m ga-anọ.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.