Ndị Ikpe 18

Nʼihi nke a, ebo Dan sitere nʼikwu ise dị nʼebo ha họpụta mmadụ ise. Ndị a bụ dimkpa, na dike nʼagha, bụrụkwa ndị si nʼobodo Zora na Eshtaol. Ha zipụrụ mmadụ ise ndị a ka ha gaa nyochaa ala ahụ ha na-achọ ibi nʼime ya. Mgbe ndị ahụ jeruru obodo ugwu ugwu Ifrem, ha gara nọdụ ọdụ abalị nʼụlọ Maịka.

Judges 18:2 (UKJV) And the children of Dan sent of their family five men from their coasts, men of valour, from Zorah, and from Eshtaol, to spy out the land, and to search it; and they said unto them, Go, search the land: who when they came to mount Ephraim, to the house of Micah, they lodged there.

1Nʼoge ahụ kwa, ụmụ Izrel enweghị eze ọbụla na-achị ha. Ebo Dan na-achọkwara onwe ha ebe obibi nke ga-abụ ala nke aka ha, nʼihi na ruo ugbu a, ha enwebeghị ike chụpụ ndị bi nʼala ahụ e kenyere ha dịka ihe nketa nke ha.

2Nʼihi nke a, ebo Dan sitere nʼikwu ise dị nʼebo ha họpụta mmadụ ise. Ndị a bụ dimkpa, na dike nʼagha, bụrụkwa ndị si nʼobodo Zora na Eshtaol. Ha zipụrụ mmadụ ise ndị a ka ha gaa nyochaa ala ahụ ha na-achọ ibi nʼime ya. Mgbe ndị ahụ jeruru obodo ugwu ugwu Ifrem, ha gara nọdụ ọdụ abalị nʼụlọ Maịka.

3Mgbe ha nọ nso ụlọ Maịka, ha nụrụ asụsụ nwokorobịa onye Livayị ahụ bụ onye nchụaja. Ha kpọpụtara ya nʼotu akụkụ jụọ ya ajụjụ sị, “Onye kpọtara gị ebe a? Gịnị ka ị na-eme nʼebe a? Gịnị mere i ji bịa nʼebe a?”

4Nwokorobịa ahụ kọwara ha ihe Maịka meere ya. Ọ gwara ha, “O nyere m ọrụ, abụkwa m onye nchụaja ya.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.