Ndị Ikpe 18

Nwokorobịa ahụ kọwara ha ihe Maịka meere ya. Ọ gwara ha, “O nyere m ọrụ, abụkwa m onye nchụaja ya.”

Judges 18:4 (UKJV) And he said unto them, Thus and thus deals Micah with me, and has hired me, and I am his priest.

2Nʼihi nke a, ebo Dan sitere nʼikwu ise dị nʼebo ha họpụta mmadụ ise. Ndị a bụ dimkpa, na dike nʼagha, bụrụkwa ndị si nʼobodo Zora na Eshtaol. Ha zipụrụ mmadụ ise ndị a ka ha gaa nyochaa ala ahụ ha na-achọ ibi nʼime ya. Mgbe ndị ahụ jeruru obodo ugwu ugwu Ifrem, ha gara nọdụ ọdụ abalị nʼụlọ Maịka.

3Mgbe ha nọ nso ụlọ Maịka, ha nụrụ asụsụ nwokorobịa onye Livayị ahụ bụ onye nchụaja. Ha kpọpụtara ya nʼotu akụkụ jụọ ya ajụjụ sị, “Onye kpọtara gị ebe a? Gịnị ka ị na-eme nʼebe a? Gịnị mere i ji bịa nʼebe a?”

4Nwokorobịa ahụ kọwara ha ihe Maịka meere ya. Ọ gwara ha, “O nyere m ọrụ, abụkwa m onye nchụaja ya.”

5Ha sịrị ya, “Ọ dị mma! Biko, jụta Chineke ase, chọpụta ma ije anyị a ọ ga-agakwa nke ọma.”

6Onye nchụaja ahụ zara sị ha, “Gaa nʼudo. Ije unu nwere ngọzị Onyenwe anyị.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.