21Ha malitekwara ije ha, ụmụntakịrị ha, na igwe anụ ụlọ ha, na ngwongwo ha ka ha tinyere nʼihu ha.
22Mgbe ha gamitụrụ nke nta site nʼụlọ Maịka, ndị ikom ndị bi nso ụlọ Maịka kpọkọtara onwe ha chụso ndị Dan, gafee ha.
23Maịka na ndị so ya na-etikwa mkpu na-akpọku ha sị ha kwụsị ije ha. Ma ndị ebo Dan jụrụ Maịka ajụjụ sị ya, “Gịnị na-eme gị iji kpọpụta ndị gị ka ha bịa lụso anyị agha?”
24Ọ zaghachiri, “Unu chịịrị chi ndị m mere, kpọrọ onye nchụaja m pụọ. Gịnị ọzọ ka m nwekwara? Olee otu unu si ajụ, ‘Gịnị na-eme gị?’ ”
25Ndị ikom Dan zara sị ya, “Lezie anya kpachara anya banyere ụdị okwu ị na-ekwu. Nʼihi na i kwuo ụdị okwu a gaa nʼihu, ụfọdụ ndị ikom isi na-anụ ọkụ ga-abịa lụso gị agha gbuo gị na ndị ezinaụlọ gị.”