Ndị Ikpe 18

Mgbe ha gamitụrụ nke nta site nʼụlọ Maịka, ndị ikom ndị bi nso ụlọ Maịka kpọkọtara onwe ha chụso ndị Dan, gafee ha.

Judges 18:22 (UKJV) And when they were a good way from the house of Micah, the men that were in the houses near to Micah's house were gathered together, and overtook the children of Dan.

20Mgbe ahụ, obi tọrọ nwokorobịa onye nchụaja ahụ ụtọ isoro ha gaa. O buuru efọọd ahụ, arụsị ezinaụlọ ndị ọzọ ahụ na oyiyi ahụ a pịrị apị soro ndị ahụ gawa.

21Ha malitekwara ije ha, ụmụntakịrị ha, na igwe anụ ụlọ ha, na ngwongwo ha ka ha tinyere nʼihu ha.

22Mgbe ha gamitụrụ nke nta site nʼụlọ Maịka, ndị ikom ndị bi nso ụlọ Maịka kpọkọtara onwe ha chụso ndị Dan, gafee ha.

23Maịka na ndị so ya na-etikwa mkpu na-akpọku ha sị ha kwụsị ije ha. Ma ndị ebo Dan jụrụ Maịka ajụjụ sị ya, “Gịnị na-eme gị iji kpọpụta ndị gị ka ha bịa lụso anyị agha?”

24Ọ zaghachiri, “Unu chịịrị chi ndị m mere, kpọrọ onye nchụaja m pụọ. Gịnị ọzọ ka m nwekwara? Olee otu unu si ajụ, ‘Gịnị na-eme gị?’ ”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.