22Mgbe ha gamitụrụ nke nta site nʼụlọ Maịka, ndị ikom ndị bi nso ụlọ Maịka kpọkọtara onwe ha chụso ndị Dan, gafee ha.
23Maịka na ndị so ya na-etikwa mkpu na-akpọku ha sị ha kwụsị ije ha. Ma ndị ebo Dan jụrụ Maịka ajụjụ sị ya, “Gịnị na-eme gị iji kpọpụta ndị gị ka ha bịa lụso anyị agha?”
24Ọ zaghachiri, “Unu chịịrị chi ndị m mere, kpọrọ onye nchụaja m pụọ. Gịnị ọzọ ka m nwekwara? Olee otu unu si ajụ, ‘Gịnị na-eme gị?’ ”
25Ndị ikom Dan zara sị ya, “Lezie anya kpachara anya banyere ụdị okwu ị na-ekwu. Nʼihi na i kwuo ụdị okwu a gaa nʼihu, ụfọdụ ndị ikom isi na-anụ ọkụ ga-abịa lụso gị agha gbuo gị na ndị ezinaụlọ gị.”
26Ya mere, ndị ebo Dan gbara ya nkịtị na-aga ebe ha na-aga. Mgbe Maịka hụrụ na ha dị ọtụtụ karịa ya, ọ hapụrụ ha, tụgharịa laghachi nʼụlọ ya.