Ndị Ikpe 19

Ma nna ya ukwu zaghachiri, “Mba! Anyị agaghị aba nʼobodo ndị na abụghị ụmụ Izrel. Anyị ga-aga nʼihu ruo Gibea.”

Judges 19:12 (UKJV) And his master said unto him, We will not turn aside here into the city of a stranger, that is not of the children of Israel; we will pass over to Gibeah.

10Ma nwoke ahụ ekweghị ịnọ ọnọdụ abalị ọzọ, ọ hapụrụ gawa nʼụzọ ije Jebus (ya bụ Jerusalem), ya na ịnyịnya ibu ya abụọ akwadoro maka njem nakwa iko ya nwanyị.

11Ha rutere ebe ahụ oge chi na-akwado iji. Ohu ya sịrị nna ya ukwu, “Bịa, ka anyị kwụsị nʼobodo ndị Jebus a, nọ ọnọdụ abalị.”

12Ma nna ya ukwu zaghachiri, “Mba! Anyị agaghị aba nʼobodo ndị na abụghị ụmụ Izrel. Anyị ga-aga nʼihu ruo Gibea.”

13O kwukwara sị, “Bịa ka anyị gbalịa iru Gibea maọbụ Rema, nọọ ọnọdụ abalị nʼotu nʼime ebe ndị a.”

14Ya mere, ha gara nʼihu nʼije ha. Anwụ dara dịka ha na-eru Gibea dị na Benjamin.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.