Ndị Ikpe 19

Ya mere, ha gara nʼihu nʼije ha. Anwụ dara dịka ha na-eru Gibea dị na Benjamin.

Judges 19:14 (UKJV) And they passed on and went their way; and the sun went down upon them when they were by Gibeah, which belongs to Benjamin.

12Ma nna ya ukwu zaghachiri, “Mba! Anyị agaghị aba nʼobodo ndị na abụghị ụmụ Izrel. Anyị ga-aga nʼihu ruo Gibea.”

13O kwukwara sị, “Bịa ka anyị gbalịa iru Gibea maọbụ Rema, nọọ ọnọdụ abalị nʼotu nʼime ebe ndị a.”

14Ya mere, ha gara nʼihu nʼije ha. Anwụ dara dịka ha na-eru Gibea dị na Benjamin.

15Nʼebe ahụ ka ha kwụsịrị ịnọ ọnọdụ abalị. Ha gara nọrọ na mbara ama obodo ahụ, ma o nweghị onye ọbụla kpọbatara ha ka ha rahụ ụra nʼụlọ ya.

16Nʼanyasị ahụ, otu agadi nwoke zutere ha ka o si ịrụ ọrụ nʼubi na-alọghachi, onye si nʼobodo ugwu ugwu Ifrem, ma o bi ka onye ọbịa na Gibea (ndị bi nʼebe a bụ ndị Benjamin).

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.