18Nwoke ahụ zara sị ya, “Anyị si Betlehem dị na Juda na-alọghachi nʼụlọ anyị dị nʼebe dị anya nʼala ugwu ugwu Ifrem. Esi m ebe ahụ gaa Betlehem dị na Juda, ma ugbu a, ana m aga nʼụlọ Onyenwe anyị. O nweghị onye kpọbatara anyị nʼụlọ ya.
19Anyị nwere ihe oriri nke ịnyịnya ibu anyị ga-eri, achịcha na mmanya nke anyị bụ ndị ohu gị ga-eri, ya bụ, mụ onwe m na ohu gị nwanyị na nwokorobịa so anyị. Anyị achọghị ihe ọbụla nʼaka onye ọbụla.”
20Agadi nwoke ahụ sịrị ha, “Batanụ nʼụlọ m dịka ndị ọbịa nke m. Ka m nye unu ihe niile bụ mkpa unu. Naanị unu anọla ọnọdụ abalị nʼama.”
21Nʼihi nke a, ọ kpọbatara ha nʼụlọ ya. O duuru ịnyịnya ibu ha, nye ha ihe oriri. Emesịa, ha sara ụkwụ ha mmiri, nọdụ ala rie ma ṅụọkwa.
22Ma mgbe ha risiri nri, nọrọ na-ezu ike, na-akpakọrịta ụka, na mberede, ndị ikom ụfọdụ sitere nʼobodo ahụ, ndị jọgburu onwe ha nʼomume gbara ụlọ ahụ gburugburu. Ha malitekwara iti aka nʼụzọ ahụ na iti mkpu na-akpọku agadi nwoke ahụ, sị ya, “Kpọpụta onye ọbịa ahụ nọ nʼime ụlọ gị ka anyị mara ya.”