20Agadi nwoke ahụ sịrị ha, “Batanụ nʼụlọ m dịka ndị ọbịa nke m. Ka m nye unu ihe niile bụ mkpa unu. Naanị unu anọla ọnọdụ abalị nʼama.”
21Nʼihi nke a, ọ kpọbatara ha nʼụlọ ya. O duuru ịnyịnya ibu ha, nye ha ihe oriri. Emesịa, ha sara ụkwụ ha mmiri, nọdụ ala rie ma ṅụọkwa.
22Ma mgbe ha risiri nri, nọrọ na-ezu ike, na-akpakọrịta ụka, na mberede, ndị ikom ụfọdụ sitere nʼobodo ahụ, ndị jọgburu onwe ha nʼomume gbara ụlọ ahụ gburugburu. Ha malitekwara iti aka nʼụzọ ahụ na iti mkpu na-akpọku agadi nwoke ahụ, sị ya, “Kpọpụta onye ọbịa ahụ nọ nʼime ụlọ gị ka anyị mara ya.”
23Agadi nwoke ahụ bụ onyenwe ụlọ ahụ pụkwuuru ha nʼezi, sị ha, “Biko ụmụnna m, unu emela ihe ọjọọ dị otu a. Nwoke a nọ nʼụlọ m dịka ọbịa. Unu emela ihe ihere dị otu a.
24Ka m kpọpụtara unu nwa m nwanyị na-amaghị nwoke, na iko nwanyị nwoke a ka unu jiri ha mee ihe ọbụla unu chọrọ ma hapụnụ nwoke a. Unu emela ihe ihere dị otu a.”