Ndị Ikpe 19

Mgbe nwoke ahụ na iko ya nwanyị, na ohu ya, jikeere ịhapụ, nna nwaagbọghọ ahụ rịọkwara ha sị ha, “Biko, lee chi ebidola iji ugbu a, abalị adịkwala nso. Biko, nọgide nʼụlọ m naanị abalị taa. Anyị ga-emekwa onwe anyị obi ụtọ abalị taa niile. Ma unu ga-amalite ije unu nʼisi ụtụtụ echi. Mgbe ahụ, unu ga-ala nʼudo.”

Judges 19:9 (UKJV) And when the man rose up to depart, he, and his concubine, and his servant, his father in law, the damsel's father, said unto him, Behold, now the day draws toward evening, I pray you tarry all night: behold, the day grows to an end, lodge here, that yours heart may be merry; and tomorrow get you early on your way, that you may go home.

7Ma mgbe nwoke ahụ biliri ka ọ laa, nna nwaagbọghọ ahụ, nọgidere ya, nke a mere ka o kwenye ịnọ ruo echi ya.

8Nʼisi ụtụtụ ụbọchị nke ise, ha bilikwara ngwangwa jikere ịhapụ ma ịlaghachi. Ọzọkwa, nna nwaagbọghọ ahụ rịọkwara ha sị ha, “Biko, nọgidenụ nʼụtụtụ taa, ma nʼoge ehihie unu nwere ike laa.” Nʼihi nke a, ha nọgidekwara rie, ṅụọ.

9Mgbe nwoke ahụ na iko ya nwanyị, na ohu ya, jikeere ịhapụ, nna nwaagbọghọ ahụ rịọkwara ha sị ha, “Biko, lee chi ebidola iji ugbu a, abalị adịkwala nso. Biko, nọgide nʼụlọ m naanị abalị taa. Anyị ga-emekwa onwe anyị obi ụtọ abalị taa niile. Ma unu ga-amalite ije unu nʼisi ụtụtụ echi. Mgbe ahụ, unu ga-ala nʼudo.”

10Ma nwoke ahụ ekweghị ịnọ ọnọdụ abalị ọzọ, ọ hapụrụ gawa nʼụzọ ije Jebus (ya bụ Jerusalem), ya na ịnyịnya ibu ya abụọ akwadoro maka njem nakwa iko ya nwanyị.

11Ha rutere ebe ahụ oge chi na-akwado iji. Ohu ya sịrị nna ya ukwu, “Bịa, ka anyị kwụsị nʼobodo ndị Jebus a, nọ ọnọdụ abalị.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.