Ndị Ikpe 2

Ma ụmụ Izrel egeghị ndị ikpe ahụ ntị, kama ha nọgidere na-akpọ isiala nye ma na-agbasokwa chi ndị ọzọ. Dịka nna nna ha na-emeghị, ha mere ngwangwa wezuga onwe ha site nʼụzọ Onyenwe anyị, bụrụ ndị na-enupu isi nʼebe iwu Onyenwe anyị dị.

Judges 2:17 (UKJV) And yet they would not hearken unto their judges, but they went a whoring after other gods, and bowed themselves unto them: they turned quickly out of the way which their fathers walked in, obeying the commandments of the LORD; but they did not so.

15Dịka ọ ṅụrụ ya nʼiyi nye ha, mgbe ọbụla ụmụ Izrel pụrụ ibu agha, aka Onyenwe anyị megidere ha ime ka ha bụrụ ndị e meriri emeri. Ọnọdụ ha jọrọ njọ nke ukwuu.

16Nʼihi ọnọdụ ọjọọ a, Onyenwe anyị mere ka ndị ikpe sị nʼetiti ha pụta, ịnapụta ha site nʼaka ndị a ji ike na-apụnara ha ihe ha nwere.

17Ma ụmụ Izrel egeghị ndị ikpe ahụ ntị, kama ha nọgidere na-akpọ isiala nye ma na-agbasokwa chi ndị ọzọ. Dịka nna nna ha na-emeghị, ha mere ngwangwa wezuga onwe ha site nʼụzọ Onyenwe anyị, bụrụ ndị na-enupu isi nʼebe iwu Onyenwe anyị dị.

18Ma mgbe ọbụla Onyenwe anyị nyere ụmụ Izrel onye ikpe, ọ na-anọnyere onye ikpe ahụ ogologo ụbọchị niile nke ndụ ya. Ọ na-esitekwa nʼaka onye ikpe a napụta ụmụ Izrel nʼaka ndị iro ha nʼihi na Onyenwe anyị nwere obi ebere nʼahụ ụmụ Izrel, mgbe ha na-asụ ude, nʼihi mmegbu na mkpagbu niile ndị iro ha na-emegbu ha, ma na-akpagbukwa ha.

19Ma mgbe ọbụla onye ikpe a nwụrụ, ụmụ Izrel na-alaghachi azụ biwe ndụ ọjọọ karịa nke nna nna ha ochie. Ha na-agbaso chi ndị ọzọ, na-akpọ isiala nye ha, na ife ha ofufe. Ha jụrụ iwezuga agwa ọjọọ ha ndị a ma ọ bụkwa ụzụ isiike ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.