15Nʼụbọchị ahụ, ndị Benjamin sitere nʼobodo ha dị iche iche kpọkọta iri puku ndị ikom abụọ na puku isii bụ ndị na-amịpụta mma agha, tinyere narị ndị ikom asaa ahụ zuruoke site na ndị bi na Gibea.
16Nʼime ndị agha ndị a, e nwere narị ndị agha asaa, ndị a maara nke ọma dịka ndị na-agbata ụta nke ọma. Ha bụ ndị na-eme aka ekpe, onye ọbụla nʼime ha nwere ike iji okwute mata otu agịrị isi, ghara ịmahie ya.
17Ma ọnụọgụgụ ndị agha ụmụ Izrel, ma ọ bụrụ na e wezuga ụmụ Benjamin, dị narị puku anọ.
18Ma tupu agha ahụ ebido, ndị agha Izrel buru ụzọ gaa Betel ịjụta Chineke ase. Ha jụrụ ya sị, “Olee ebo ga-edu anyị ibuso ndị agha Benjamin agha?” Onyenwe anyị zara sị ha na ọ bụ Juda ga-ebu ụzọ.
19Nʼihi nke a, nʼisi ụtụtụ echi ya, ndị agha ụmụ Izrel niile buliri ihe agha ha pụọ, maa ụlọ ikwu ha nso nso Gibea.