Ndị Ikpe 20

Nʼụbọchị ahụ, ndị Benjamin sitere nʼobodo ha dị iche iche kpọkọta iri puku ndị ikom abụọ na puku isii bụ ndị na-amịpụta mma agha, tinyere narị ndị ikom asaa ahụ zuruoke site na ndị bi na Gibea.

Judges 20:15 (UKJV) And the children of Benjamin were numbered at that time out of the cities twenty and six thousand men that drew sword, beside the inhabitants of Gibeah, which were numbered seven hundred chosen men.

13Ugbu a, kpọpụtara anyị ndị ikom ọjọọ dị a si nʼobodo Gibea ka anyị gbuo ha. Anyị ga-esikwa otu a hichapụ ihe ọjọọ a site nʼIzrel.” Ma ụmụ Benjamin egeghị ndị Izrel ibe ha ntị.

14Ha sitere nʼobodo ha dị iche iche zukọtaa na Gibea maka ibuso ndị Izrel agha.

15Nʼụbọchị ahụ, ndị Benjamin sitere nʼobodo ha dị iche iche kpọkọta iri puku ndị ikom abụọ na puku isii bụ ndị na-amịpụta mma agha, tinyere narị ndị ikom asaa ahụ zuruoke site na ndị bi na Gibea.

16Nʼime ndị agha ndị a, e nwere narị ndị agha asaa, ndị a maara nke ọma dịka ndị na-agbata ụta nke ọma. Ha bụ ndị na-eme aka ekpe, onye ọbụla nʼime ha nwere ike iji okwute mata otu agịrị isi, ghara ịmahie ya.

17Ma ọnụọgụgụ ndị agha ụmụ Izrel, ma ọ bụrụ na e wezuga ụmụ Benjamin, dị narị puku anọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.