40Ma mgbe anwụrụ ọkụ malitere ịla elu site nʼobodo ahụ, ndị Benjamin lere anya nʼazụ hụ ka anwụrụ ọkụ na-ala elu site nʼakụkụ niile nke obodo ahụ.
41Mgbe ahụ, ndị Izrel bidoro igbu ha, oke egwu jidere ndị Benjamin nʼihi na ha ghọtara na ịla nʼiyi adakwasịla ha.
42Ha si nʼihu ndị Izrel gbaa ọsọ, gbaga nʼụzọ gawara nʼọzara, ma ha enweghị ike ịgbanarị agha ahụ. Ndị Izrel si nʼobodo Gibea gbapụta gburu ha nʼebe ahụ.
43Ha gbara ndị Benjamin gburugburu nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ Gibea, gbuo ọtụtụ nʼime ha nʼebe ahụ.
44Ndị agha Benjamin e gburu nʼagha ụbọchị ahụ dị puku iri na asatọ.