Ndị Ikpe 20

Ha gbara ndị Benjamin gburugburu nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ Gibea, gbuo ọtụtụ nʼime ha nʼebe ahụ.

Judges 20:43 (UKJV) Thus they enclosed the Benjamites round about, and chased them, and trode them down with ease opposite to Gibeah toward the sunrising.

41Mgbe ahụ, ndị Izrel bidoro igbu ha, oke egwu jidere ndị Benjamin nʼihi na ha ghọtara na ịla nʼiyi adakwasịla ha.

42Ha si nʼihu ndị Izrel gbaa ọsọ, gbaga nʼụzọ gawara nʼọzara, ma ha enweghị ike ịgbanarị agha ahụ. Ndị Izrel si nʼobodo Gibea gbapụta gburu ha nʼebe ahụ.

43Ha gbara ndị Benjamin gburugburu nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ Gibea, gbuo ọtụtụ nʼime ha nʼebe ahụ.

44Ndị agha Benjamin e gburu nʼagha ụbọchị ahụ dị puku iri na asatọ.

45Mgbe ha chigharịrị na-agbala nʼụzọ ọzara na-aga nʼebe oke nkume Rimọn dị, ndị Izrel gburu puku ndị agha ise nʼime ha nʼụzọ ahụ. Ha chụgidere ndị Benjamin ọsọ ruo Gidom, gbukwaa puku ndị agha ha abụọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.