Ndị Ikpe 20

Mgbe ha chigharịrị na-agbala nʼụzọ ọzara na-aga nʼebe oke nkume Rimọn dị, ndị Izrel gburu puku ndị agha ise nʼime ha nʼụzọ ahụ. Ha chụgidere ndị Benjamin ọsọ ruo Gidom, gbukwaa puku ndị agha ha abụọ.

Judges 20:45 (UKJV) And they turned and fled toward the wilderness unto the rock of Rimmon: and they gleaned of them in the highways five thousand men; and pursued hard after them unto Gidom, and slew two thousand men of them.

43Ha gbara ndị Benjamin gburugburu nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ Gibea, gbuo ọtụtụ nʼime ha nʼebe ahụ.

44Ndị agha Benjamin e gburu nʼagha ụbọchị ahụ dị puku iri na asatọ.

45Mgbe ha chigharịrị na-agbala nʼụzọ ọzara na-aga nʼebe oke nkume Rimọn dị, ndị Izrel gburu puku ndị agha ise nʼime ha nʼụzọ ahụ. Ha chụgidere ndị Benjamin ọsọ ruo Gidom, gbukwaa puku ndị agha ha abụọ.

46Ya mere, ndị Benjamin e gburu nʼagha nʼụbọchị ahụ dị iri puku abụọ, na ise. Ndị a bụ ndị agha mma agha, dike na dimkpa nʼagha.

47Naanị narị ndị agha isii nʼime ha tụgharịrị gbapụ ọsọ gbalaga nʼọzara, nʼebe nkume Rimọn dị. Ha nọgidere nʼebe ahụ ọnwa anọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.