Ndị Ikpe 21

Olee otu anyị ga-esi nwetara ndị fọdụrụ nwunye ha ga-alụ ebe anyị ṅụrụ iyi site nʼaha Onyenwe anyị na anyị agaghị enye ha ụmụ anyị ndị inyom?”

Judges 21:7 (UKJV) How shall we do for wives for them that remain, seeing we have sworn by the LORD that we will not give them of our daughters to wives?

5Emesịa, ha jụrịtara onwe ha ajụjụ sị, “O nwere ebo Izrel na-enweghị onye nọchiri anya ha nʼihu Onyenwe anyị anyị mgbe anyị zukọrọ na Mizpa?” Nʼihi na ha ṅụrụ iyi kwuo na onye ọbụla jụrụ ịbịa nʼihu Onyenwe anyị na Mizpa aghaghị ịnwụ.

6Ma oke iru ụjụ dị nʼala Izrel dum nʼihi ihe dakwasịrị ụmụnna ha, bụ ndị Benjamin. Ha niile kwuru sị, “Taa, otu ebo Izrel alaala nʼiyi, e kpochapụla ya.

7Olee otu anyị ga-esi nwetara ndị fọdụrụ nwunye ha ga-alụ ebe anyị ṅụrụ iyi site nʼaha Onyenwe anyị na anyị agaghị enye ha ụmụ anyị ndị inyom?”

8Mgbe ahụ, ha jụrụ ajụjụ sị, “O nwere ebo Izrel na-esoghị anyị zukọta mgbe anyị zukọtara nʼihu Onyenwe anyị na Mizpa?” Ha chọpụtara na o nweghị onye ọbụla si na Jebesh Gilead bịa.

9Nʼihi na mgbe ha gụrụ ndị zukọrọ ọnụ, ha chọpụtara na o nweghị ndị si Jebesh Gilead bịa.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.