Ndị Ikpe 3

Ụmụ Izrel mere ihe jọrọ njọ nʼanya Onyenwe anyị. Ha chefuru Onyenwe anyị Chineke ha, malite ife chi Baal, na Ashera ofufe.

Judges 3:7 (UKJV) And the children of Israel did evil in the sight of the LORD, and forgotten about the LORD their God, and served Baalim and the groves.

5Nʼihi nke a, ụmụ Izrel biri nʼetiti ndị Kenan, ndị Het, ndị Hiv, ndị Periz, ndị Amọrait, na ndị Jebus.

6Ha lụtaara onwe ha ụmụ ha ndị inyom na nwunye, werekwa ụmụ ha ndị inyom nye ụmụ ha ndị ikom, feekwa chi ha niile ofufe.

7Ụmụ Izrel mere ihe jọrọ njọ nʼanya Onyenwe anyị. Ha chefuru Onyenwe anyị Chineke ha, malite ife chi Baal, na Ashera ofufe.

8Nʼihi ya, iwe ọkụ Onyenwe anyị kpaliri megide ụmụ Izrel. Ọ raara ha nye nʼaka eze Kushan Rishataim, eze Aram Naharaim, onye ndị Izrel nọrọ nʼokpuru ọchịchị ya afọ asatọ.

9Ma mgbe ụmụ Izrel kpọkuru Onyenwe anyị, o mere ka Otniel, nwa Kenaz, bilie nʼetiti ha. Otniel bụ nwa nwanne Kaleb nke nta. Ọ bụkwa ya napụtara ụmụ Izrel site nʼaka ndị iro ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.