Ndị Ikpe 3

Ma mgbe ụmụ Izrel kpọkuru Onyenwe anyị, o mere ka Otniel, nwa Kenaz, bilie nʼetiti ha. Otniel bụ nwa nwanne Kaleb nke nta. Ọ bụkwa ya napụtara ụmụ Izrel site nʼaka ndị iro ha.

Judges 3:9 (UKJV) And when the children of Israel cried unto the LORD, the LORD raised up a deliverer to the children of Israel, who delivered them, even Othniel the son of Kenaz, Caleb's younger brother.

7Ụmụ Izrel mere ihe jọrọ njọ nʼanya Onyenwe anyị. Ha chefuru Onyenwe anyị Chineke ha, malite ife chi Baal, na Ashera ofufe.

8Nʼihi ya, iwe ọkụ Onyenwe anyị kpaliri megide ụmụ Izrel. Ọ raara ha nye nʼaka eze Kushan Rishataim, eze Aram Naharaim, onye ndị Izrel nọrọ nʼokpuru ọchịchị ya afọ asatọ.

9Ma mgbe ụmụ Izrel kpọkuru Onyenwe anyị, o mere ka Otniel, nwa Kenaz, bilie nʼetiti ha. Otniel bụ nwa nwanne Kaleb nke nta. Ọ bụkwa ya napụtara ụmụ Izrel site nʼaka ndị iro ha.

10Mmụọ Onyenwe anyị bịakwasịrị ya, nke mere ka ọ bụrụ onye ikpe ndị Izrel, ọ pụrụ ibu agha. Onyenwe anyị nyefere Kushan Rishataim bụ eze ndị Aram nʼaka Otniel, onye ike ya karịrị nke ya.

11Sitekwa nʼoge ahụ gaa nʼihu, udo dịịrị nʼala niile iri afọ anọ, mgbe Otniel na-ekpe Izrel ikpe. Nʼikpeazụ, Otniel, nwa Kenaz nwụrụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.