Ndị Ikpe 3

Sitekwa nʼoge ahụ gaa nʼihu, udo dịịrị nʼala niile iri afọ anọ, mgbe Otniel na-ekpe Izrel ikpe. Nʼikpeazụ, Otniel, nwa Kenaz nwụrụ.

Judges 3:11 (UKJV) And the land had rest forty years. And Othniel the son of Kenaz died.

9Ma mgbe ụmụ Izrel kpọkuru Onyenwe anyị, o mere ka Otniel, nwa Kenaz, bilie nʼetiti ha. Otniel bụ nwa nwanne Kaleb nke nta. Ọ bụkwa ya napụtara ụmụ Izrel site nʼaka ndị iro ha.

10Mmụọ Onyenwe anyị bịakwasịrị ya, nke mere ka ọ bụrụ onye ikpe ndị Izrel, ọ pụrụ ibu agha. Onyenwe anyị nyefere Kushan Rishataim bụ eze ndị Aram nʼaka Otniel, onye ike ya karịrị nke ya.

11Sitekwa nʼoge ahụ gaa nʼihu, udo dịịrị nʼala niile iri afọ anọ, mgbe Otniel na-ekpe Izrel ikpe. Nʼikpeazụ, Otniel, nwa Kenaz nwụrụ.

12Ụmụ Izrel bidoro ime ihe ọjọọ nʼanya Onyenwe anyị. Ya mere, Onyenwe anyị nyefere ha nʼaka Eglọn, eze Moab.

13Ọ kpọtara ndị Amọn na ndị Amalek ka ha dịnyere ya. Eglọn bịara buso ndị Izrel agha, nweta obodo Nkwụ, ya abụrụzia nke ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.