Ndị Ikpe 4

Nʼihi na o nwere narị ụgbọ agha igwe itoolu, ma megbukwaa ụmụ Izrel nke ukwu iri afọ abụọ, ha tikuru Onyenwe anyị mkpu akwa, ka o nyere ha aka.

Judges 4:3 (UKJV) And the children of Israel cried unto the LORD: for he had nine hundred chariots of iron; and twenty years he mightily oppressed the children of Israel.

1Mgbe Ehud nwụsịrị, ụmụ Izrel mekwara ihe ọjọọ megide Onyenwe anyị.

2Nʼihi ya, Onyenwe anyị renyere ha nʼaka Jabin, eze Kenan, onye chịrị nʼobodo Hazọ. Aha onyeisi ndị agha ya bụ Sisera, onye bi nʼobodo a na-akpọ Heroshet Hagoyim.

3Nʼihi na o nwere narị ụgbọ agha igwe itoolu, ma megbukwaa ụmụ Izrel nke ukwu iri afọ abụọ, ha tikuru Onyenwe anyị mkpu akwa, ka o nyere ha aka.

4Nʼoge a, Debọra, bụ nwanyị na-ebu amụma, nwunye Lapidọt bụ onyendu ụmụ Izrel.

5Ọ na-anọ nʼokpuru osisi nkwụ a na-akpọ Nkwụ Debọra, nke dị nʼagbata Rema na Betel, bụ nʼala ugwu ugwu Ifrem na-ekpe ikpe. Nʼebe ahụ ka ụmụ Izrel na-ejekwuru ya ka o doziere ha okwu ha niile.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.