Ndị Ikpe 4

Ọ na-anọ nʼokpuru osisi nkwụ a na-akpọ Nkwụ Debọra, nke dị nʼagbata Rema na Betel, bụ nʼala ugwu ugwu Ifrem na-ekpe ikpe. Nʼebe ahụ ka ụmụ Izrel na-ejekwuru ya ka o doziere ha okwu ha niile.

Judges 4:5 (UKJV) And she dwelt under the palm tree of Deborah between Ramah and Bethel in mount Ephraim: and the children of Israel came up to her for judgment.

3Nʼihi na o nwere narị ụgbọ agha igwe itoolu, ma megbukwaa ụmụ Izrel nke ukwu iri afọ abụọ, ha tikuru Onyenwe anyị mkpu akwa, ka o nyere ha aka.

4Nʼoge a, Debọra, bụ nwanyị na-ebu amụma, nwunye Lapidọt bụ onyendu ụmụ Izrel.

5Ọ na-anọ nʼokpuru osisi nkwụ a na-akpọ Nkwụ Debọra, nke dị nʼagbata Rema na Betel, bụ nʼala ugwu ugwu Ifrem na-ekpe ikpe. Nʼebe ahụ ka ụmụ Izrel na-ejekwuru ya ka o doziere ha okwu ha niile.

6O ziri ozi kpọọ Barak, nwa Abinoam, onye bi nʼobodo Kedesh, nke dị nʼime Naftalị, ọ sịrị ya, “Onyenwe anyị Chineke ụmụ Izrel na-enye gị iwu, ‘Gaa chịkọtaa puku ndị agha iri bụ ndị sitere nʼebo Naftalị na Zebụlọn, duru ha jeruo ugwu Taboa.

7Aga m edute Sisera, ọchịagha ndị agha Jabin, mee ka ọ bịaruo nso iyi ukwu Kishọn, ya na ụgbọ agha ya niile na ndị agha ya niile ma nyefee ha nʼaka gị.’ ”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.