15Ndị ndu ebo Isaka pụkwutekwara Debọra. E, Isaka sokwara Barak na ndagwurugwu ahụ ka ezigara ha nʼokpuru ya. Ma nʼetiti ndị Ruben, ha nọ na-atụgharị uche.
16Gịnị mere unu ji nọdụ nʼetiti ọgba atụrụ, ịnụ ụda ọja a na-egburu igwe atụrụ? Nʼetiti obodo niile nke Ruben, ka e nwere ọtụtụ ntụgharị uche.
17Ndị Gilead nọgidere nʼofe ọzọ nke osimiri Jọdan. Ndị Dan nọgidekwara nʼime ụgbọ mmiri ha. Ndị Asha nọgidere nʼahụ udo nʼakụkụ ọnụ mmiri.
18Ma ndị Zebụlọn na Naftalị jiri ndụ ha chụọ aja, pụọ nʼọzara ibu agha ahụ.
19“Ndị eze ala Kenan bịara ọgụ na Teanak, nʼakụkụ mmiri ala Megido. Ma ha enweghị mmeri ọbụla. Ha akwataghị ọlaọcha maọbụ ihe nkwata ọzọ nʼagha.