17Ndị Gilead nọgidere nʼofe ọzọ nke osimiri Jọdan. Ndị Dan nọgidekwara nʼime ụgbọ mmiri ha. Ndị Asha nọgidere nʼahụ udo nʼakụkụ ọnụ mmiri.
18Ma ndị Zebụlọn na Naftalị jiri ndụ ha chụọ aja, pụọ nʼọzara ibu agha ahụ.
19“Ndị eze ala Kenan bịara ọgụ na Teanak, nʼakụkụ mmiri ala Megido. Ma ha enweghị mmeri ọbụla. Ha akwataghị ọlaọcha maọbụ ihe nkwata ọzọ nʼagha.
20Ọ bụladị kpakpando niile dị na mbara eluigwe lụrụ ọgụ megide Sisera.
21Mmiri na-achị ọkụ nke iyi ukwu Kishọn bupụrụ ha niile. Ya mere, mkpụrụobi m gaa nʼihu, zoo ụkwụ gị nʼala, dị ike dịka ọdụm!