14Ụfọdụ si Ifrem bịa, bụ ndị ahụ nwere mgbọrọgwụ nʼala ndị Amalek, ndị Benjamin sokwa pụta, ndị ndu sikwa Makia bịa, ndị na-eso ndị ndu sikwa Zebụlọn pụta.
15Ndị ndu ebo Isaka pụkwutekwara Debọra. E, Isaka sokwara Barak na ndagwurugwu ahụ ka ezigara ha nʼokpuru ya. Ma nʼetiti ndị Ruben, ha nọ na-atụgharị uche.
16Gịnị mere unu ji nọdụ nʼetiti ọgba atụrụ, ịnụ ụda ọja a na-egburu igwe atụrụ? Nʼetiti obodo niile nke Ruben, ka e nwere ọtụtụ ntụgharị uche.
17Ndị Gilead nọgidere nʼofe ọzọ nke osimiri Jọdan. Ndị Dan nọgidekwara nʼime ụgbọ mmiri ha. Ndị Asha nọgidere nʼahụ udo nʼakụkụ ọnụ mmiri.
18Ma ndị Zebụlọn na Naftalị jiri ndụ ha chụọ aja, pụọ nʼọzara ibu agha ahụ.